Abụ Maka Asụsụ M (A poem about my language )

Asụsụ m, a hụrụ m gị n’anya nke ukwuu.
Ị na-eme ka obi tọọ nne na nna m ụtọ ma m sụọ gị.
Ị na-eme ka ndị ezi ghara ịnụ izu anyị na-agba.
Ị na-eme ka m nwee akọ n’uche zuru oke.

Mgbe ọbụla m sụrụ gị,
Obi na-atọ m ụtọ,
Ọṅụ na-eju m obi,
Ọ na-adị ndị amaghị asụ ka ha bụrụ m.

E kwere m gị nkwa na:
Agaghị m egbu gị site n’ịhapụ ịsụ gị.
Aga m agwa onye ọbụla mkpa ị dị.
Aga m akụziri onye ọbụla chọrọ ịmụta.

N’ihi na:
Ị bụ ihe e jiri mara m.
Asụsụ m, ị ga adị oo!

Obianuju Bob-Madumere